donspirado88 at 24-08-2011 12:11 PM (13 years ago)
(m)
Ndi igbo ibe m... Oworo m anya nke oma na-anyi ahapuola igbo anyi ga-na asu bia nwere bekee n'emeju okwu. Kedu ihe mere asusu igbo??? O bu na-anyi amaghi etu esi asu ma o bu na ede olu igbo. Ugbu a, anyi choro imata onye kasi ede asusu igbo. (Iwu anyi bu gi ajula mmadu ibe gi, Dee ka i siri mmuta) Anyi choro imata ma asusu igbo anozikwaya ka o adala mba.
NDEWO!!!
Posted: at 24-08-2011 12:11 PM (13 years ago) | Upcoming
donspirado88 at 3-09-2011 02:07 AM (13 years ago) (m)
E chetara m mgbe elu bu ala osa... Onye elena anya na-azu, mmanwu anyi na-aga n'iro, Onye lee anya n'azu.......................................... Amaghi m ka anyi enwezikwara umuaka na Obodo anyi taa. O buru m ezigbo ihe nwute na egwu onwa anyuola ka oku. Ezi okwu, O jogburu udele ma si gbuo nkawu n'isi....
Posted: at 3-09-2011 02:07 AM (13 years ago) | Upcoming
kebela, nwa oma, ezigbo nwafo igbo. Udo dikwara gi. Amabughi m na i bu onye uko chukwu rue otua. Omalicha nwa igbo ji eme onu. M na eweliri gi aka elu maka ihe dum na ntuzi aka nile i na ede na atuzikwa tutubo-tutubo (respectively) na naijapali.
O were ewu na okuko anya na ndi igbo mara ka esi enyomi asusu di iche iche na nba nile di n'uwa, ma wekwaa anya na anyi adighi atufu olu anyi maoli. Na obodo amirika nke m birila otutu afo, oha na eze ndi igbo agbaala nbo ikuziri umu igbo etu esi asu ma dekwaa okwu igbo. Biko onye no ebe o'no jisi ike kuziwe asusu anyi oke o nwere ike. Udo diri anyi dum. Ka Chineke mezie okwu.
Posted: at 30-10-2011 03:12 AM (13 years ago) | Upcoming
chizze i bu nu nwoke ike ji eme onu........amaghim na ibu nwa afo igbo nna.........umu igbo na eme ife siri ike odi nfe........nwanne oga adiririri gi na mma......ka olisa bi n'elu igwe mere gi ife nile bu mkpa gi.........iga ebu isi ocha bata na ekeresima nwoke na mma udo chia na ndu gi
my name is kebella ........yu already no that ...heheh...if yu wanna smell what kebella is cooking........bring it up!!
Posted: at 30-10-2011 08:56 AM (13 years ago) | Addicted Hero
KB, asim ndu nmiri ndu azu. Egbe bere ugo bere. M na'ayo olisa bi na igwe ka o juputa ebun na'uche anyi nili na afo oma ya, ma mezuo nkwa ngozi na oganihu ya na ndu anyi. Nwannem, anwuchile maka ekpere oma dum i kperele m. O ga adiri nma n'aha Olisa bi na Igweh. Ka Chineke mezie okwu.
Posted: at 31-10-2011 11:17 PM (13 years ago) | Upcoming